2 Ndị Eze 4:21
2 Kings 4:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nne ya kuuru ya rigoo nʼelu ụlọ ahụ, tọgbọ ya nʼelu ihe ndina ahụ onye nke Chineke ahụ na-edina, mechie ụzọ pụọ.
2 Kings 4:21 in English
2 Kings 4:21 · Berean Standard Bible
And she went up and laid him on the bed of the man of God. Then she shut the door and went out.
Context
19O tikuru nna ya sị ya, “Isi m o, isi m o!”
Nna ya sịrị otu nʼime ndị ohu ya, “Kuru ya kulaara nne ya.” 20O kuuru ya, kulaara ya nne ya, nwantakịrị nwoke ahụ nọdụrụ nʼapata nne ya ruo etiti ehihie, mgbe ọ nwụrụ. 21Nne ya kuuru ya rigoo nʼelu ụlọ ahụ, tọgbọ ya nʼelu ihe ndina ahụ onye nke Chineke ahụ na-edina, mechie ụzọ pụọ. 22O ziri ozi kpọọ di ya sị ya, “Biko, zitere m otu okorobịa na otu ịnyịnya ibu, ka m jekwuru onye Chineke ahụ. Aga m alọtakwa ọsịịsọ.” 23Ọ sịrị, “Gịnị mere i ji ejekwuru ya taa? Ọ bụghị Ọnwa ọhụrụ, ọ bụghịkwa ụbọchị izuike.”
Ọ zara sị, “Udo dị.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.