2 Ndị Eze 4:20
2 Kings 4:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
O kuuru ya, kulaara ya nne ya, nwantakịrị nwoke ahụ nọdụrụ nʼapata nne ya ruo etiti ehihie, mgbe ọ nwụrụ.
2 Kings 4:20 in English
2 Kings 4:20 · Berean Standard Bible
After the servant had picked him up and carried him to his mother, the boy sat on her lap until noon, and then he died.
Context
18Nwata ahụ toputara, otu ụbọchị ọ pụrụ jekwuru nna ya nʼubi, ebe ha nọ na-aghọ ọka. 19O tikuru nna ya sị ya, “Isi m o, isi m o!”
Nna ya sịrị otu nʼime ndị ohu ya, “Kuru ya kulaara nne ya.” 20O kuuru ya, kulaara ya nne ya, nwantakịrị nwoke ahụ nọdụrụ nʼapata nne ya ruo etiti ehihie, mgbe ọ nwụrụ. 21Nne ya kuuru ya rigoo nʼelu ụlọ ahụ, tọgbọ ya nʼelu ihe ndina ahụ onye nke Chineke ahụ na-edina, mechie ụzọ pụọ. 22O ziri ozi kpọọ di ya sị ya, “Biko, zitere m otu okorobịa na otu ịnyịnya ibu, ka m jekwuru onye Chineke ahụ. Aga m alọtakwa ọsịịsọ.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.