Native Bible

2 Kings 25:29 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼihi nke a, Jehoiakin gbanwere uwe mkpọrọ ya, wezuga ya. Sitekwa nʼoge ahụ, tutu ruo mgbe ọ nwụrụ, ya na eze na-erikọ nri.

2 Kings 25:29 in English

2 Kings 25:29 · Berean Standard Bible

So Jehoiachin changed out of his prison clothes, and he dined regularly at the king’s table for the rest of his life.

Context

27Nʼafọ nke iri atọ na asaa, site na mgbe e mere ka Jehoiakin eze Juda gaa biri nʼala ọzọ, nʼafọ Awel-Maduk* ghọrọ eze Babilọn, o mere ka Jehoiakin si nʼụlọ mkpọrọ pụta nwere onwe ya. Ọ bụ nʼụbọchị nke iri abụọ na asaa nke ọnwa iri na abụọ ka o mere nke a. 28Ọ gwara ya okwu ọma, nye ya oche ọnọdụ ya dị elu karịa nke ndị eze ndị ọzọ ya na ha nọ na Babilọn. 29Nʼihi nke a, Jehoiakin gbanwere uwe mkpọrọ ya, wezuga ya. Sitekwa nʼoge ahụ, tutu ruo mgbe ọ nwụrụ, ya na eze na-erikọ nri. 30Site nʼụbọchị ruo nʼụbọchị, eze Babilọn na-enye Jehoiakin oke ihe ruru ya kwa ụbọchị niile nke ọ dị ndụ. 25:4 Maọbụ, Babilọn 25:4 Ya bụ ndagwurugwu Jọdan 25:17 Nzọ ụkwụ iri abụọ na asaa 25:17 Nzọ ụkwụ anọ na ọkara 25:27 Ọ bụ ya bụkwa Evil-Merodak.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.