Native Bible

2 Kings 24:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

O mere ihe jọrọ njọ nʼanya Onyenwe anyị, dịka nna ya ha mere.

2 Kings 24:9 in English

2 Kings 24:9 · Berean Standard Bible

And he did evil in the sight of the LORD, just as his father had done.

Context

7Ma eze Ijipt esiteghị nʼala ya pụta ọzọ, nʼihi na eze Babilọn nọchiri oke ala ya niile, site na mmiri iyi Ijipt ruo nʼoke Osimiri Yufretis. 8Jehoiakin gbara afọ iri na asatọ mgbe ọ malitere ịbụ eze. Ọ chịrị naanị ọnwa atọ na Jerusalem. Aha nne ya bụ Nehushta, nwa Elnatan, onye Jerusalem. 9O mere ihe jọrọ njọ nʼanya Onyenwe anyị, dịka nna ya ha mere. 10Nʼoge ọ bụ eze, ndịisi Nebukadneza, eze Babilọn bịara, gbaa Jerusalem gburugburu ma nọchibido obodo ahụ nʼagha. 11Nebukadneza, eze Babilọn nʼonwe ya, bịara nʼobodo ahụ mgbe ndị agha ya gbara ya gburugburu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.