2 Ndị Eze 24:11
2 Kings 24:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nebukadneza, eze Babilọn nʼonwe ya, bịara nʼobodo ahụ mgbe ndị agha ya gbara ya gburugburu.
2 Kings 24:11 in English
2 Kings 24:11 · Berean Standard Bible
And Nebuchadnezzar king of Babylon came to the city while his servants were besieging it.
Context
9O mere ihe jọrọ njọ nʼanya Onyenwe anyị, dịka nna ya ha mere. 10Nʼoge ọ bụ eze, ndịisi Nebukadneza, eze Babilọn bịara, gbaa Jerusalem gburugburu ma nọchibido obodo ahụ nʼagha. 11Nebukadneza, eze Babilọn nʼonwe ya, bịara nʼobodo ahụ mgbe ndị agha ya gbara ya gburugburu. 12Jehoiakin, bụ eze Juda, na nne ya na ndị ọrụ ya niile na ndịisi niile na ndịisi ozi ya niile were onwe ha nyefee Nebukadneza nʼaka.
Nʼafọ asatọ nke ọchịchị eze Babilọn ka ọ kpụụrụ Jehoiakin dịka onye mkpọrọ. 13Ọ kwakọọrọ akụ niile dị nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, na ndị nke dị nʼụlọeze, o gbukakwara ihe ọlaedo niile Solomọn eze Izrel tinyere nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị buru ha bulaa Babilọn, ihe a niile mere dịka Onyenwe anyị kwururịị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.