2 Ndị Eze 24:5
2 Kings 24:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Akụkọ ọzọ niile gbasara ọchịchị Jehoiakim na ihe niile o mere, e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe e mere nʼụbọchị ndụ ndị eze Juda?
2 Kings 24:5 in English
2 Kings 24:5 · Berean Standard Bible
As for the rest of the acts of Jehoiakim, along with all his accomplishments, are they not written in the Book of the Chronicles of the Kings of Judah?
Context
3Nʼezie, ihe ndị a bịakwasịrị Juda dịka Onyenwe anyị si nye ya nʼiwu, ka o si otu a kpochapụ ha site nʼihu ya nʼihi mmehie niile Manase mere, na dịka ihe niile o mere si dị, 4tinyere ọbara ndị aka ha dị ọcha nke ọ wusiri. Nʼihi na o mere ka ọbara ndị aka ha dị ọcha jupụta na Jerusalem. Onyenwe anyị ekwekwaghị agbaghara ajọ omume dị otu a. 5Akụkọ ọzọ niile gbasara ọchịchị Jehoiakim na ihe niile o mere, e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe e mere nʼụbọchị ndụ ndị eze Juda? 6Jehoiakim sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ. Jehoiakin nwa ya ghọrọ eze ọhụrụ nʼọnọdụ ya. 7Ma eze Ijipt esiteghị nʼala ya pụta ọzọ, nʼihi na eze Babilọn nọchiri oke ala ya niile, site na mmiri iyi Ijipt ruo nʼoke Osimiri Yufretis.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.