2 Ndị Eze 24:6
2 Kings 24:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Jehoiakim sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ. Jehoiakin nwa ya ghọrọ eze ọhụrụ nʼọnọdụ ya.
2 Kings 24:6 in English
2 Kings 24:6 · Berean Standard Bible
And Jehoiakim rested with his fathers, and his son Jehoiachin reigned in his place.
Context
4tinyere ọbara ndị aka ha dị ọcha nke ọ wusiri. Nʼihi na o mere ka ọbara ndị aka ha dị ọcha jupụta na Jerusalem. Onyenwe anyị ekwekwaghị agbaghara ajọ omume dị otu a. 5Akụkọ ọzọ niile gbasara ọchịchị Jehoiakim na ihe niile o mere, e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe e mere nʼụbọchị ndụ ndị eze Juda? 6Jehoiakim sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ. Jehoiakin nwa ya ghọrọ eze ọhụrụ nʼọnọdụ ya. 7Ma eze Ijipt esiteghị nʼala ya pụta ọzọ, nʼihi na eze Babilọn nọchiri oke ala ya niile, site na mmiri iyi Ijipt ruo nʼoke Osimiri Yufretis. 8Jehoiakin gbara afọ iri na asatọ mgbe ọ malitere ịbụ eze. Ọ chịrị naanị ọnwa atọ na Jerusalem. Aha nne ya bụ Nehushta, nwa Elnatan, onye Jerusalem.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.