Native Bible

2 Kings 24:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Iri afọ abụọ na otu ka Zedekaya gbara mgbe ọ malitere ịbụ eze nʼime Jerusalem. Aha nne ya bụ Hamutal, nwa Jeremaya onye Libna. Ọ chịrị dịka eze na Jerusalem afọ iri na otu.

2 Kings 24:18 in English

2 Kings 24:18 · Berean Standard Bible

Zedekiah was twenty-one years old when he became king, and he reigned in Jerusalem eleven years. His mother’s name was Hamutal daughter of Jeremiah; she was from Libnah.

Context

16Eze Babilọn bupụkwara ndị ikom niile dị ike ma tozukwaa ibu agha, ndị ọnụọgụgụ ha dị puku asaa, tinyere otu puku ndị ọrụ aka, na ndị ọrụ ǹka, bulaa ha Babilọn. 17O mere nwanne nna Jehoiakin, bụ Matanaya, eze nʼọnọdụ ya. Ọ gụgharịrị ya aha, kpọọ ya Zedekaya. 18Iri afọ abụọ na otu ka Zedekaya gbara mgbe ọ malitere ịbụ eze nʼime Jerusalem. Aha nne ya bụ Hamutal, nwa Jeremaya onye Libna. Ọ chịrị dịka eze na Jerusalem afọ iri na otu. 19Ma o mere ihe jọrọ njọ nʼanya Onyenwe anyị dịka Jehoiakim mere.* 20Ọ bụ nʼihi iwe Onyenwe anyị ka ihe ndị a niile ji bịakwasị Jerusalem na Juda. Nʼikpeazụ, o sitere nʼihu ya chụpụ ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.