Native Bible

2 Kings 23:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

O sikwa nʼụlọnsọ Onyenwe anyị bupụ ogidi chi Ashera,* wezuga ya nʼazụ Jerusalem, na Ndagwurugwu Kidrọn. Ebe ahụ ka ọ nọ suo ya ọkụ, supịa ya ka ọ ghọọ ntụ, fesaa ya nʼebe a na-eli ndị mmadụ efu.

2 Kings 23:6 in English

2 Kings 23:6 · Berean Standard Bible

He brought the Asherah pole from the house of the LORD to the Kidron Valley outside Jerusalem, and there he burned it, ground it to powder, and threw its dust on the graves of the common people.

Context

4Eze nyere Hilkaya onyeisi nchụaja na ndị nchụaja na-esote nʼọkwa, na ndị na-eche ọnụ ụzọ mbata, iwu ka ha site nʼụlọnsọ Onyenwe anyị kwapụtasịa ngwongwo niile e mere nye Baal, na Ashera, na usuu ihe niile nke mbara eluigwe.* O sunyere ha niile ọkụ nʼazụ Jerusalem, nʼọhịa dị na Ndagwurugwu Kidrọn, buru ntụ ha bulaa Betel.* 5Ọ chụdara ndị nchụaja arụsị ndị ahụ niile, bụ ndị eze Juda họpụtara isure ihe na-esi isi ụtọ nʼelu ebe dị elu nke obodo Juda nakwa ebe dị ọkụ. Nʼihi na ndị nchụaja ndị a achụọla aja, surekwaa ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼebe ịchụ aja dị nʼelu ugwu niile dị nʼobodo dị iche iche na Juda, nakwa ndị dị gburugburu Jerusalem. Ha bụ ndị surere ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye Baal, na anyanwụ, ọnwa na kpakpando, nyekwa usuu niile nke mbara eluigwe. 6O sikwa nʼụlọnsọ Onyenwe anyị bupụ ogidi chi Ashera,* wezuga ya nʼazụ Jerusalem, na Ndagwurugwu Kidrọn. Ebe ahụ ka ọ nọ suo ya ọkụ, supịa ya ka ọ ghọọ ntụ, fesaa ya nʼebe a na-eli ndị mmadụ efu. 7Ọ kwadakwara ụlọ obibi ụmụ ndị ikom na-agba akwụna dị nọ nʼụlọnsọ Onyenwe anyị. Nʼebe ndị inyom na-anọ na-akpara Ashera akwa. 8O mere ka ndị nchụaja niile site nʼobodo Juda niile bịa, o merụkwara ebe ịchụ aja niile nke dị elu, site na Geba ruo Bịasheba, ebe ndị nchụaja ndị a nọrọ suree ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ. Ọ kwatụrụ ọnụ ụzọ ama nke dị nʼebe ọnụ ụzọ ama Joshua, onye bụ gọvanọ obodo, nke dị nʼakụkụ aka ekpe nke ọnụ ụzọ ama obodo.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.