2 Ndị Eze 23:7
2 Kings 23:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ kwadakwara ụlọ obibi ụmụ ndị ikom na-agba akwụna dị nọ nʼụlọnsọ Onyenwe anyị. Nʼebe ndị inyom na-anọ na-akpara Ashera akwa.
2 Kings 23:7 in English
2 Kings 23:7 · Berean Standard Bible
He also tore down the quarters of the male shrine prostitutes that were in the house of the LORD, where the women had woven tapestries for Asherah.
Context
5Ọ chụdara ndị nchụaja arụsị ndị ahụ niile, bụ ndị eze Juda họpụtara isure ihe na-esi isi ụtọ nʼelu ebe dị elu nke obodo Juda nakwa ebe dị ọkụ. Nʼihi na ndị nchụaja ndị a achụọla aja, surekwaa ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼebe ịchụ aja dị nʼelu ugwu niile dị nʼobodo dị iche iche na Juda, nakwa ndị dị gburugburu Jerusalem. Ha bụ ndị surere ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye Baal, na anyanwụ, ọnwa na kpakpando, nyekwa usuu niile nke mbara eluigwe. 6O sikwa nʼụlọnsọ Onyenwe anyị bupụ ogidi chi Ashera,* wezuga ya nʼazụ Jerusalem, na Ndagwurugwu Kidrọn. Ebe ahụ ka ọ nọ suo ya ọkụ, supịa ya ka ọ ghọọ ntụ, fesaa ya nʼebe a na-eli ndị mmadụ efu. 7Ọ kwadakwara ụlọ obibi ụmụ ndị ikom na-agba akwụna dị nọ nʼụlọnsọ Onyenwe anyị. Nʼebe ndị inyom na-anọ na-akpara Ashera akwa. 8O mere ka ndị nchụaja niile site nʼobodo Juda niile bịa, o merụkwara ebe ịchụ aja niile nke dị elu, site na Geba ruo Bịasheba, ebe ndị nchụaja ndị a nọrọ suree ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ. Ọ kwatụrụ ọnụ ụzọ ama nke dị nʼebe ọnụ ụzọ ama Joshua, onye bụ gọvanọ obodo, nke dị nʼakụkụ aka ekpe nke ọnụ ụzọ ama obodo. 9Ma e kweghị ka ndị nchụaja ahụ jee ozi nʼụlọnsọ Onyenwe anyị dị na Jerusalem, ma o nyere ha ike iso ndị nchụaja ndị ọzọ rie achịcha a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.