Native Bible

2 Kings 22:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ahụ, Shefan bụ ode akwụkwọ, gwara eze sị, “O nwere akwụkwọ Hilkaya, onye nchụaja nyere m.” Shefan gụpụtara ihe dị nʼakwụkwọ a nʼihu eze.

2 Kings 22:10 in English

2 Kings 22:10 · Berean Standard Bible

Moreover, Shaphan the scribe told the king, “Hilkiah the priest has given me a book.” And Shaphan read it in the presence of the king.

Context

8Hilkaya onyeisi nchụaja, sịrị Shefan ode akwụkwọ, “Achọtala m Akwụkwọ Iwu* nʼime ụlọnsọ Onyenwe anyị.” O nyere ya Shefan, onye nke gụkwara ya. 9Mgbe ahụ, Shefan, bụ ode akwụkwọ, bịakwutere eze, gwa ya sị, “Ndị ozi gị enyefela ego niile nke dị nʼụlọnsọ Onyenwe anyị nʼaka ndị ọrụ na nʼaka ndị nlekọta nọ nʼụlọnsọ Onyenwe anyị.” 10Mgbe ahụ, Shefan bụ ode akwụkwọ, gwara eze sị, “O nwere akwụkwọ Hilkaya, onye nchụaja nyere m.” Shefan gụpụtara ihe dị nʼakwụkwọ a nʼihu eze. 11Mgbe eze nụrụ okwu niile dị nʼime Akwụkwọ Iwu ahụ, ọ dọwara uwe ya.* 12O nyere Hilkaya bụ onyeisi nchụaja, Ahikam nwa Shefan, Akboa nwa Mikaya, Shefan ode akwụkwọ na Asaya, bụ onye ọrụ eze, iwu, sị ha,

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.