2 Ndị Eze 22:12
2 Kings 22:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
O nyere Hilkaya bụ onyeisi nchụaja, Ahikam nwa Shefan, Akboa nwa Mikaya, Shefan ode akwụkwọ na Asaya, bụ onye ọrụ eze, iwu, sị ha,
2 Kings 22:12 in English
2 Kings 22:12 · Berean Standard Bible
and commanded Hilkiah the priest, Ahikam son of Shaphan, Achbor * son of Micaiah,* Shaphan the scribe, and Asaiah the servant of the king:
Context
10Mgbe ahụ, Shefan bụ ode akwụkwọ, gwara eze sị, “O nwere akwụkwọ Hilkaya, onye nchụaja nyere m.” Shefan gụpụtara ihe dị nʼakwụkwọ a nʼihu eze. 11Mgbe eze nụrụ okwu niile dị nʼime Akwụkwọ Iwu ahụ, ọ dọwara uwe ya.* 12O nyere Hilkaya bụ onyeisi nchụaja, Ahikam nwa Shefan, Akboa nwa Mikaya, Shefan ode akwụkwọ na Asaya, bụ onye ọrụ eze, iwu, sị ha, 13“Gaanụ jụta Onyenwe anyị ase, nʼisi m na nʼisi ndị m, na Juda niile, banyere ihe niile e dere nʼakwụkwọ a nke a chọtara. Nʼihi na ọnụma Onyenwe anyị dị ukwuu bụ nke na-ere ọkụ megide anyị, nʼihi na ndị bu anyị ụzọ erubeghị isi nʼokwu nke akwụkwọ iwu a, ha agbasoghị ihe niile e dere nʼime ya banyere anyị.” 14Hilkaya onye nchụaja, Ahikam, Akboa, Shefan na Asaya, jekwuuru Hulda, bụ onye amụma nwanyị. Onye bụ nwunye Shalum, nwa Tikva, nwa Hahas, ọ bụ onye na-elekọta uwe. Hulda na-ebi na mpaghara Jerusalem e wuru ọhụrụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.