2 Ndị Eze 21:20
2 Kings 21:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
O mere ihe dị njọ nʼanya Onyenwe anyị dịka nna ya Manase mere.
2 Kings 21:20 in English
2 Kings 21:20 · Berean Standard Bible
And he did evil in the sight of the LORD, as his father Manasseh had done.
Context
18Manase soro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya nʼime ubi a gbara ogige nʼụlọeze ya, bụ ubi Ụza a gbara ogige. Amọn nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya. 19Amọn gbara iri afọ abụọ na abụọ mgbe ọ malitere ịbụ eze. Ọ chịrị afọ abụọ na Jerusalem. Aha nne ya bụ Meshulemet, ada Haruz onye Jotba. 20O mere ihe dị njọ nʼanya Onyenwe anyị dịka nna ya Manase mere. 21Ọ gbasoro ụzọ ahụ niile dị iche nke nna ya gbasoro. O fere arụsị niile nke nna ya fere, kpọọkwa isiala nye ha.* 22Ọ jụrụ iso Onyenwe anyị, bụ Chineke nna nna ya ha, jụkwa ibi ndụ irube isi nye ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.