Native Bible

2 Kings 21:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

nʼihi na ha emeela ihe dị njọ nʼanya m, kpasukwaa m iwe, site nʼụbọchị nna nna ha si Ijipt pụta ọbụladị ruo taa.”

2 Kings 21:15 in English

2 Kings 21:15 · Berean Standard Bible

because they have done evil in My sight and have provoked Me to anger from the day their fathers came out of Egypt until this day.’”

Context

13Aga m esetipụ eriri ịtụ ọtụtụ nke m ji megide Sameria na ihe ịtụ mgbidi nke m ji megide ụlọ Ehab, nʼelu Jerusalem. Aga m ehichapụ Jerusalem dịka mmadụ si ehichapụ efere, hichaa ya ihu na azụ ma kpuo ya ihu nʼala. 14Aga m agbakụtakwa ndị fọdụrụ nʼihe nketa m azụ, were ha nyefee nʼaka ndị iro ha. Ha ga-aghọ ihe anaara nʼike, ghọọkwa ihe nkwata nʼagha nye ndị iro ha niile, 15nʼihi na ha emeela ihe dị njọ nʼanya m, kpasukwaa m iwe, site nʼụbọchị nna nna ha si Ijipt pụta ọbụladị ruo taa.” 16Nke ka nke, Manase gbukwara ọtụtụ ndị aka ha dị ọcha, ruo na ọ wụsaara ọbara ha site nʼotu akụkụ Jerusalem ruo nʼakụkụ nke ọzọ ya, nke a agụnyeghị mmehie ahụ nke o dubara ndị Juda ime, nke mere ka ha mee ihe dị njọ nʼanya Onyenwe anyị. 17Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Manase na ihe niile o mere, tinyere mmehie niile nke o mere, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe mere nʼoge ndị eze Juda?

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.