2 Ndị Eze 21:14
2 Kings 21:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Aga m agbakụtakwa ndị fọdụrụ nʼihe nketa m azụ, were ha nyefee nʼaka ndị iro ha. Ha ga-aghọ ihe anaara nʼike, ghọọkwa ihe nkwata nʼagha nye ndị iro ha niile,
2 Kings 21:14 in English
2 Kings 21:14 · Berean Standard Bible
So I will forsake the remnant of My inheritance and deliver them into the hands of their enemies. And they will become plunder and spoil to all their enemies,
Context
12Ya mere, nke a bụ ihe Onyenwe anyị, bụ Chineke nke Izrel, sịrị: Lee, ana m aga iweta mbibi dị ukwuu nke ga-adakwasị Jerusalem na Juda, nke ntị ọbụla nụrụ ya ga-azụ wuruwuru. 13Aga m esetipụ eriri ịtụ ọtụtụ nke m ji megide Sameria na ihe ịtụ mgbidi nke m ji megide ụlọ Ehab, nʼelu Jerusalem. Aga m ehichapụ Jerusalem dịka mmadụ si ehichapụ efere, hichaa ya ihu na azụ ma kpuo ya ihu nʼala. 14Aga m agbakụtakwa ndị fọdụrụ nʼihe nketa m azụ, were ha nyefee nʼaka ndị iro ha. Ha ga-aghọ ihe anaara nʼike, ghọọkwa ihe nkwata nʼagha nye ndị iro ha niile, 15nʼihi na ha emeela ihe dị njọ nʼanya m, kpasukwaa m iwe, site nʼụbọchị nna nna ha si Ijipt pụta ọbụladị ruo taa.” 16Nke ka nke, Manase gbukwara ọtụtụ ndị aka ha dị ọcha, ruo na ọ wụsaara ọbara ha site nʼotu akụkụ Jerusalem ruo nʼakụkụ nke ọzọ ya, nke a agụnyeghị mmehie ahụ nke o dubara ndị Juda ime, nke mere ka ha mee ihe dị njọ nʼanya Onyenwe anyị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.