2 Ndị Eze 20:7
2 Kings 20:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ, Aịzaya sịrị, “Kwadoonụ mmanụ fiig dị ọkụ.” Ha mere nke a, teekwasị ya nʼelu etuto ahụ, ahụ dịkwara ya mma.
2 Kings 20:7 in English
2 Kings 20:7 · Berean Standard Bible
Then Isaiah said, “Prepare a poultice of figs.” So they brought it and applied it to the boil, and Hezekiah recovered.
Context
5“Gaghachi azụ, gaa gwa Hezekaya, onye na-achị ndị m, ‘Otu a ka Onyenwe anyị bụ Chineke nna gị Devid, kwuru: Anụla m ekpere gị, ahụkwala m anya mmiri akwa gị, aga m agwọ gị. Aga m eme ka ahụ dị gị ike nʼụbọchị nke atọ site taa, mgbe ahụ ị ga-aga nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị. 6Aga m atụkwasị afọ iri na ise nʼụbọchị ndụ gị. Aga m anapụtakwa gị na obodo a site nʼaka eze Asịrịa. Aga m echebe obodo a nʼihi mụ onwe m, na nʼihi Devid, bụ ohu m.’ ” 7Mgbe ahụ, Aịzaya sịrị, “Kwadoonụ mmanụ fiig dị ọkụ.” Ha mere nke a, teekwasị ya nʼelu etuto ahụ, ahụ dịkwara ya mma. 8Mgbe ahụ, Hezekaya jụrụ Aịzaya sị, “Gịnị ga-abụ ihe ịrịbama na Onyenwe anyị ga-agwọ m, na m ga-aga nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị nʼụbọchị nke atọ na-abịa nʼihu?” 9Aịzaya zara, “Nke a bụ ihe ama Onyenwe anyị nye gị na Onyenwe anyị ga-emezu ihe o kwere na nkwa. Ị chọrọ ka onyinyo a gaa nʼihu ihe nrigo iri, ka ọ bụ ka ọ laa azụ ihe nrigo iri?”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.