2 Ndị Eze 20:9
2 Kings 20:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Aịzaya zara, “Nke a bụ ihe ama Onyenwe anyị nye gị na Onyenwe anyị ga-emezu ihe o kwere na nkwa. Ị chọrọ ka onyinyo a gaa nʼihu ihe nrigo iri, ka ọ bụ ka ọ laa azụ ihe nrigo iri?”
2 Kings 20:9 in English
2 Kings 20:9 · Berean Standard Bible
And Isaiah had replied, “This will be a sign to you from the LORD that He will do what He has promised: Would you like the shadow to go forward ten steps, or back ten steps?”
Context
7Mgbe ahụ, Aịzaya sịrị, “Kwadoonụ mmanụ fiig dị ọkụ.” Ha mere nke a, teekwasị ya nʼelu etuto ahụ, ahụ dịkwara ya mma. 8Mgbe ahụ, Hezekaya jụrụ Aịzaya sị, “Gịnị ga-abụ ihe ịrịbama na Onyenwe anyị ga-agwọ m, na m ga-aga nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị nʼụbọchị nke atọ na-abịa nʼihu?” 9Aịzaya zara, “Nke a bụ ihe ama Onyenwe anyị nye gị na Onyenwe anyị ga-emezu ihe o kwere na nkwa. Ị chọrọ ka onyinyo a gaa nʼihu ihe nrigo iri, ka ọ bụ ka ọ laa azụ ihe nrigo iri?” 10Hezekaya zara sị, “Ọ dị mfe ka onyinyo gaa nʼihu nzọ ụkwụ iri. Ma mee ka onyinyo a laa azụ ihe nrigo iri.” 11Mgbe ahụ, Aịzaya, onye amụma rịọrọ Onyenwe anyị ka o meere Hezekaya nke a. Onyenwe anyị mekwara ka onyinyo laghachi azụ ihe nrigo iri dịka o si gbada nʼihe nrigo ụlọ Ehaz.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.