2 Ndị Eze 20:6
2 Kings 20:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Aga m atụkwasị afọ iri na ise nʼụbọchị ndụ gị. Aga m anapụtakwa gị na obodo a site nʼaka eze Asịrịa. Aga m echebe obodo a nʼihi mụ onwe m, na nʼihi Devid, bụ ohu m.’ ”
2 Kings 20:6 in English
2 Kings 20:6 · Berean Standard Bible
I will add fifteen years to your life. And I will deliver you and this city from the hand of the king of Assyria. I will defend this city for My sake and for the sake of My servant David.’”
Context
4Tupu Aịzaya esite nʼetiti ogige ụlọeze pụọ, okwu nke Onyenwe anyị rutere ya ntị, sị ya: 5“Gaghachi azụ, gaa gwa Hezekaya, onye na-achị ndị m, ‘Otu a ka Onyenwe anyị bụ Chineke nna gị Devid, kwuru: Anụla m ekpere gị, ahụkwala m anya mmiri akwa gị, aga m agwọ gị. Aga m eme ka ahụ dị gị ike nʼụbọchị nke atọ site taa, mgbe ahụ ị ga-aga nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị. 6Aga m atụkwasị afọ iri na ise nʼụbọchị ndụ gị. Aga m anapụtakwa gị na obodo a site nʼaka eze Asịrịa. Aga m echebe obodo a nʼihi mụ onwe m, na nʼihi Devid, bụ ohu m.’ ” 7Mgbe ahụ, Aịzaya sịrị, “Kwadoonụ mmanụ fiig dị ọkụ.” Ha mere nke a, teekwasị ya nʼelu etuto ahụ, ahụ dịkwara ya mma. 8Mgbe ahụ, Hezekaya jụrụ Aịzaya sị, “Gịnị ga-abụ ihe ịrịbama na Onyenwe anyị ga-agwọ m, na m ga-aga nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị nʼụbọchị nke atọ na-abịa nʼihu?”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.