2 Ndị Eze 20:19
2 Kings 20:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Hezekaya zaghachiri, “Okwu Onyenwe anyị nke i kwuru dị mma.” Nʼihi na o chere nʼobi ya sị, “Ọ bụ na udo na nchekwa agaghị adị nʼoge ndụ m?”
2 Kings 20:19 in English
2 Kings 20:19 · Berean Standard Bible
But Hezekiah said to Isaiah, “The word of the LORD that you have spoken is good.” For he thought, “Will there not at least be peace and security in my lifetime?”
Context
17Lee, oge na-abịa mgbe a ga-eburu ihe niile dị nʼụlọeze gị, na ihe niile nke nna nna gị ha debere nʼụlọakụ ruo taa, buru ha bulaa Babilọn. Ọ dịkwaghị ihe ga-afọdụ, otu a ka Onyenwe anyị kwuru. 18A ga-ebupụ ụfọdụ nʼime ụmụ gị, ndị bụ ahụ na ọbara gị,* ndị a ga-amụtara gị, buru ha pụọ nʼebe dị anya, ha ga-abụ ndị onozi nʼụlọeze nke eze Babilọn.” 19Hezekaya zaghachiri, “Okwu Onyenwe anyị nke i kwuru dị mma.” Nʼihi na o chere nʼobi ya sị, “Ọ bụ na udo na nchekwa agaghị adị nʼoge ndụ m?” 20Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Hezekaya, ọrụ niile ọ rụrụ, tinyere ọdọ mmiri o gwuru, na olulu ọwa mmiri* na-aga o gwuru, nke o ji webata mmiri nʼime obodo, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe mere nʼoge ndị eze Juda? 21Hezekaya sooro ndị nna nna ya dinaa nʼọnwụ. Manase nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.
20:12 Merodak, bụ aha chi ndị Babilọn a na-akpọ Maadọk, Ọ bụ ya ka a gụrụ nwa Baladan.
20:18 Ụmụ sị nʼahụ gị pụta
20:20 Hezekaya gbobichiri mmiri iyi Gaihọn, gwuo olulu ebe mmiri a si aga, ka ọ dịrị ha mfe i nweta mmiri ma ndị iro gbaa Jerusalem gburugburu nʼoge agha. 2Ih 32:30
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.