2 Ndị Eze 20:17
2 Kings 20:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Lee, oge na-abịa mgbe a ga-eburu ihe niile dị nʼụlọeze gị, na ihe niile nke nna nna gị ha debere nʼụlọakụ ruo taa, buru ha bulaa Babilọn. Ọ dịkwaghị ihe ga-afọdụ, otu a ka Onyenwe anyị kwuru.
2 Kings 20:17 in English
2 Kings 20:17 · Berean Standard Bible
The time will surely come when everything in your palace and all that your fathers have stored up until this day will be carried off to Babylon. Nothing will be left, says the LORD.
Context
15Onye amụma jụrụ, “Gịnị ka ha hụrụ nʼụlọ gị?”
Hezekaya zara sị, “Ihe niile nke dị nʼụlọ m ka ha hụrụ. Ọ dịghị ihe niile dị nʼụlọakụ m nke m na-egosighị ha.” 16Mgbe ahụ, Aịzaya sịrị Hezekaya, “Gee ntị nụrụ okwu Onyenwe anyị. 17Lee, oge na-abịa mgbe a ga-eburu ihe niile dị nʼụlọeze gị, na ihe niile nke nna nna gị ha debere nʼụlọakụ ruo taa, buru ha bulaa Babilọn. Ọ dịkwaghị ihe ga-afọdụ, otu a ka Onyenwe anyị kwuru. 18A ga-ebupụ ụfọdụ nʼime ụmụ gị, ndị bụ ahụ na ọbara gị,* ndị a ga-amụtara gị, buru ha pụọ nʼebe dị anya, ha ga-abụ ndị onozi nʼụlọeze nke eze Babilọn.” 19Hezekaya zaghachiri, “Okwu Onyenwe anyị nke i kwuru dị mma.” Nʼihi na o chere nʼobi ya sị, “Ọ bụ na udo na nchekwa agaghị adị nʼoge ndụ m?”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.