Native Bible

2 Kings 2:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

O ruo mgbe Onyenwe anyị chọrọ ị kpọrọ Ịlaịja laa nʼeluigwe site nʼoke ifufe, Ịlaịja na Ịlaisha nọ nʼụzọ sitere Gilgal.

2 Kings 2:1 in English

2 Kings 2:1 · Berean Standard Bible

Shortly before the LORD took Elijah up to heaven in a whirlwind, Elijah and Elisha were on their way from Gilgal,

Context

1O ruo mgbe Onyenwe anyị chọrọ ị kpọrọ Ịlaịja laa nʼeluigwe site nʼoke ifufe, Ịlaịja na Ịlaisha nọ nʼụzọ sitere Gilgal. 2Ịlaịja sịrị Ịlaisha, “Nọdụ nʼebe a, nʼihi na Onyenwe anyị ziri m ozi ka m gaa Betel.”* Ma Ịlaisha zara sị ya, “Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, na dịka gị onwe gị nọkwa na-adị ndụ, agaghị m ahapụ gị.” Ya mere, ha abụọ sooro gaa Betel. 3Nʼebe ahụ, ụmụ okorobịa ndị amụma nọ na Betel pụtara zute ha abụọ. Ndị amụma ahụ bịakwutere Ịlaisha sị ya, “Ị maara na Onyenwe anyị ga-esi nʼebe ị nọ wepụ onyenwe gị Ịlaịja taa?” Ịlaisha sịrị, “Mụ onwe m maara, ma unu nọrọ nwayọọ.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.