Native Bible

2 Kings 18:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼafọ nke anọ nke ọchịchị Hezekaya, nke bụkwa afọ nke asaa nke ọchịchị Hoshea nwa Elaa, bụ eze Izrel, Shalmanesa, eze Asịrịa gbagoro imegide Sameria, nọchibido ya gburugburu.

2 Kings 18:9 in English

2 Kings 18:9 · Berean Standard Bible

In the fourth year of Hezekiah’s reign, which was the seventh year of the reign of Hoshea son of Elah over Israel, Shalmaneser king of Assyria marched against Samaria and besieged it.

Context

7Onyenwe anyị nọnyeere ya nʼebe ọbụla ọ gara, ihe niile o mere gaara ya nke ọma. O nupuru isi jụ ịnọkwa nʼokpuru eze ndị Asịrịa, o fekwaghị ya ofufe. 8O tigburu ndị Filistia nʼala ha niile ruo na Gaza, na obodo dị ya gburugburu. Ọ lara obodo ahụ niile nʼiyi, obodo ukwu niile e wusiri ike na obodo nta niile a na-ewusighị ike. 9Nʼafọ nke anọ nke ọchịchị Hezekaya, nke bụkwa afọ nke asaa nke ọchịchị Hoshea nwa Elaa, bụ eze Izrel, Shalmanesa, eze Asịrịa gbagoro imegide Sameria, nọchibido ya gburugburu. 10Mgbe afọ atọ gasịrị, nʼafọ nke isii nke ọchịchị Hezekaya, na afọ nke itoolu nke ọchịchị Hoshea, bụ eze Izrel, ndị agha Asịrịa dọtara Sameria nʼagha. 11Ọ bụ nʼoge ahụ ka eze Asịrịa bupụrụ ndị Izrel niile bulaa ha Asịrịa nʼime obodo Hala, na Gozan nʼakụkụ iyi ukwu Hoboa, na nʼobodo ndị Midia.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.