Native Bible

2 Kings 18:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ bụ nʼoge ahụ ka eze Asịrịa bupụrụ ndị Izrel niile bulaa ha Asịrịa nʼime obodo Hala, na Gozan nʼakụkụ iyi ukwu Hoboa, na nʼobodo ndị Midia.

2 Kings 18:11 in English

2 Kings 18:11 · Berean Standard Bible

The king of Assyria exiled the Israelites to Assyria and settled them in Halah, in Gozan by the Habor River, and in the cities of the Medes.

Context

9Nʼafọ nke anọ nke ọchịchị Hezekaya, nke bụkwa afọ nke asaa nke ọchịchị Hoshea nwa Elaa, bụ eze Izrel, Shalmanesa, eze Asịrịa gbagoro imegide Sameria, nọchibido ya gburugburu. 10Mgbe afọ atọ gasịrị, nʼafọ nke isii nke ọchịchị Hezekaya, na afọ nke itoolu nke ọchịchị Hoshea, bụ eze Izrel, ndị agha Asịrịa dọtara Sameria nʼagha. 11Ọ bụ nʼoge ahụ ka eze Asịrịa bupụrụ ndị Izrel niile bulaa ha Asịrịa nʼime obodo Hala, na Gozan nʼakụkụ iyi ukwu Hoboa, na nʼobodo ndị Midia. 12Nke a mere nʼihi na ha jụrụ ige ntị nʼolu Onyenwe anyị bụ Chineke ha, jụkwa ime ihe ọ chọrọ ka ha mee. Ha edebeghị ọgbụgba ndụ ya na iwu niile Mosis onyeozi Onyenwe anyị nyere ha. Ha jụrụ ige ntị nʼiwu ndị a, maọbụ debe ha. 13Nʼafọ nke iri na anọ nke ọchịchị eze Hezekaya, Senakerib bụ eze Asịrịa, busoro obodo Juda niile e wusiri ike agha, merikwaa ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.