Native Bible

2 Kings 18:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼafọ nke iri na anọ nke ọchịchị eze Hezekaya, Senakerib bụ eze Asịrịa, busoro obodo Juda niile e wusiri ike agha, merikwaa ha.

2 Kings 18:13 in English

2 Kings 18:13 · Berean Standard Bible

In the fourteenth year of Hezekiah’s reign, Sennacherib king of Assyria attacked and captured all the fortified cities of Judah.

Context

11Ọ bụ nʼoge ahụ ka eze Asịrịa bupụrụ ndị Izrel niile bulaa ha Asịrịa nʼime obodo Hala, na Gozan nʼakụkụ iyi ukwu Hoboa, na nʼobodo ndị Midia. 12Nke a mere nʼihi na ha jụrụ ige ntị nʼolu Onyenwe anyị bụ Chineke ha, jụkwa ime ihe ọ chọrọ ka ha mee. Ha edebeghị ọgbụgba ndụ ya na iwu niile Mosis onyeozi Onyenwe anyị nyere ha. Ha jụrụ ige ntị nʼiwu ndị a, maọbụ debe ha. 13Nʼafọ nke iri na anọ nke ọchịchị eze Hezekaya, Senakerib bụ eze Asịrịa, busoro obodo Juda niile e wusiri ike agha, merikwaa ha. 14Mgbe ahụ, Hezekaya chọrọ ụzọ ọ ga-esi mee udo, zie ozi zigara eze Asịrịa nʼobodo Lakish sị ya, “Emehiela m, biko, site nʼala m pụọ. Aga m akwụ gị ihe ọbụla ị chọrọ nʼaka m.” Eze Asịrịa sitere nʼaka Hezekaya eze Juda nara narị talenti ọlaọcha atọ, na iri talenti ọlaedo atọ. 15Hezekaya chịịrị ọlaọcha niile ọ chọtara nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, na akụ niile dị nʼụlọeze, nye ya eze Asịrịa.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.