Native Bible

2 Kings 18:28 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ahụ, ọchịagha ahụ guzoro were oke olu kwuo nʼasụsụ Hibru, sị, “Nụrụnụ okwu eze ukwu ahụ, bụ eze Asịrịa.

2 Kings 18:28 in English

2 Kings 18:28 · Berean Standard Bible

Then the Rabshakeh stood and called out loudly in Hebrew: “Hear the word of the great king, the king of Assyria!

Context

26Mgbe ahụ, Eliakịm nwa Hilkaya, Shebna na Joa sịrị ọchịagha ahụ, “Biko, gwa ndị ohu gị okwu nʼasụsụ Aramaik,* ebe ọ bụ na anyị na-aghọta ya. Agwala anyị okwu nʼasụsụ Hibru, ebe ndị nọ nʼelu mgbidi ga-anụ.” 27Ma ọchịagha ahụ zaghachiri, “Ọ bụ nʼihi naanị nna unu ukwu na nye unu onwe unu ka nna m ukwu ji zite m, ka m kwuo ihe ndị a? Ọ bụghị nʼihi ndị mmadụ ahụ na-anọdụ nʼelu mgbidi, ndị, dịka unu, ha ga-eso rie nsị ha nyụrụ, ṅụọkwa mamịrị ha nyụrụ?” 28Mgbe ahụ, ọchịagha ahụ guzoro were oke olu kwuo nʼasụsụ Hibru, sị, “Nụrụnụ okwu eze ukwu ahụ, bụ eze Asịrịa. 29Nke a bụ ihe eze sịrị, unu ekwela ka Hezekaya duhie unu. Ọ pụghị ịzọpụta unu site nʼaka m. 30Unu ekwela ka Hezekaya mee ka unu tụkwasị Onyenwe anyị obi. Mgbe ọ na-asị, ‘Nʼezie, Onyenwe anyị aghaghị ịnapụta anyị, a gaghị enyefe obodo a nʼaka eze Asịrịa.’

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.