Native Bible

2 Kings 18:29 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nke a bụ ihe eze sịrị, unu ekwela ka Hezekaya duhie unu. Ọ pụghị ịzọpụta unu site nʼaka m.

2 Kings 18:29 in English

2 Kings 18:29 · Berean Standard Bible

This is what the king says: Do not let Hezekiah deceive you; he cannot deliver you from my hand.

Context

27Ma ọchịagha ahụ zaghachiri, “Ọ bụ nʼihi naanị nna unu ukwu na nye unu onwe unu ka nna m ukwu ji zite m, ka m kwuo ihe ndị a? Ọ bụghị nʼihi ndị mmadụ ahụ na-anọdụ nʼelu mgbidi, ndị, dịka unu, ha ga-eso rie nsị ha nyụrụ, ṅụọkwa mamịrị ha nyụrụ?” 28Mgbe ahụ, ọchịagha ahụ guzoro were oke olu kwuo nʼasụsụ Hibru, sị, “Nụrụnụ okwu eze ukwu ahụ, bụ eze Asịrịa. 29Nke a bụ ihe eze sịrị, unu ekwela ka Hezekaya duhie unu. Ọ pụghị ịzọpụta unu site nʼaka m. 30Unu ekwela ka Hezekaya mee ka unu tụkwasị Onyenwe anyị obi. Mgbe ọ na-asị, ‘Nʼezie, Onyenwe anyị aghaghị ịnapụta anyị, a gaghị enyefe obodo a nʼaka eze Asịrịa.’ 31“Unu aṅakwala Hezekaya ntị. Ihe a ka eze Asịrịa kwuru: Pụkwutenụ m, bịanụ ka mụ na unu mee udo.* Mgbe ahụ, onye ọbụla nʼime unu ga-eri mkpụrụ si nʼubi vaịnị ya na nke si nʼosisi fiig ya, ṅụọkwa mmiri* nke si nʼihe icheta mmiri ya:

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.