Native Bible

2 Kings 15:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Onyenwe anyị tiri eze ihe otiti ọrịa ekpenta ruo ụbọchị ọnwụ ya.* O biri nʼụlọ ewupụrụ iche. Jotam* nwa nwoke eze ghọrọ onye nlekọta ụlọeze na-achịkwa ndị ala ahụ.

2 Kings 15:5 in English

2 Kings 15:5 · Berean Standard Bible

And the LORD afflicted the king with leprosy * until the day he died, so that he lived in a separate house while his son Jotham had charge of the palace and governed the people of the land.

Context

3O soro nzọ ụkwụ nna ya bụ Amazaya, mee ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị. 4Kama dịka eze ndị ọzọ, o wezugaghị ebe ịchụ aja dị nʼelu ugwu; ndị mmadụ gara nʼihu na-achụ aja nsure ọkụ na aja na-esi isi ụtọ nʼebe ahụ. 5Onyenwe anyị tiri eze ihe otiti ọrịa ekpenta ruo ụbọchị ọnwụ ya.* O biri nʼụlọ ewupụrụ iche. Jotam* nwa nwoke eze ghọrọ onye nlekọta ụlọeze na-achịkwa ndị ala ahụ. 6Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Azaraya, na ihe niile o mere, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe mere nʼoge ndị eze Juda? 7Azaraya soro ndị nna nna ya dina nʼọnwụ, e lie ya nso nʼebe e liri ha, nʼime obodo Devid. Jotam nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.