2 Ndị Eze 15:4
2 Kings 15:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Kama dịka eze ndị ọzọ, o wezugaghị ebe ịchụ aja dị nʼelu ugwu; ndị mmadụ gara nʼihu na-achụ aja nsure ọkụ na aja na-esi isi ụtọ nʼebe ahụ.
2 Kings 15:4 in English
2 Kings 15:4 · Berean Standard Bible
Nevertheless, the high places were not taken away; the people continued sacrificing and burning incense there.
Context
2Ọ gbara afọ iri na isii mgbe ọ malitere ị bụ eze. Ọ chịkwara na Jerusalem iri afọ ise na abụọ. Aha nne ya bụ Jekolaya, onye Jerusalem. 3O soro nzọ ụkwụ nna ya bụ Amazaya, mee ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị. 4Kama dịka eze ndị ọzọ, o wezugaghị ebe ịchụ aja dị nʼelu ugwu; ndị mmadụ gara nʼihu na-achụ aja nsure ọkụ na aja na-esi isi ụtọ nʼebe ahụ. 5Onyenwe anyị tiri eze ihe otiti ọrịa ekpenta ruo ụbọchị ọnwụ ya.* O biri nʼụlọ ewupụrụ iche. Jotam* nwa nwoke eze ghọrọ onye nlekọta ụlọeze na-achịkwa ndị ala ahụ. 6Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Azaraya, na ihe niile o mere, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe mere nʼoge ndị eze Juda?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.