2 Ndị Eze 15:33
2 Kings 15:33 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ gbara iri afọ abụọ na ise mgbe ọ ghọrọ eze. Ọ chịrị afọ iri na isii na Jerusalem. Aha nne ya bụ Jerusha, nwa Zadọk.
2 Kings 15:33 in English
2 Kings 15:33 · Berean Standard Bible
He was twenty-five years old when he became king, and he reigned in Jerusalem sixteen years. His mother’s name was Jerusha * daughter of Zadok.
Context
31Akụkọ banyere Peka na ihe niile o mere, e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe ndị eze Izrel niile mere nʼụbọchị ndụ ha? 32Nʼafọ nke abụọ nke ọchịchị Peka nwa Remalaya eze Izrel ka Jotam nwa Ụzaya eze Juda malitere ọchịchị ya. 33Ọ gbara iri afọ abụọ na ise mgbe ọ ghọrọ eze. Ọ chịrị afọ iri na isii na Jerusalem. Aha nne ya bụ Jerusha, nwa Zadọk. 34O mere ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị dịka nna ya Ụzaya mere. 35Kama, o wezugaghị ebe ịchụ aja dị nʼelu ugwu, ndị mmadụ gara nʼihu na-achụ aja nsure ọkụ dị iche iche na aja na-esi isi ụtọ nʼebe ahụ. Jotam wugharịrị Ọnụ Ụzọ ama nke dị Elu nke ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.