2 Ndị Eze 14:8
2 Kings 14:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ, Amazaya zigara ndị ozi ka ha jekwuru Jehoash nwa Jehoahaz nwa Jehu, eze Izrel, zie ya ozi ịma aka, sị, “Bịa, ka dimkpa na ibe ya zute ihu na ihu nʼagha.”
2 Kings 14:8 in English
2 Kings 14:8 · Berean Standard Bible
Then Amaziah sent messengers to the king of Israel Jehoash son of Jehoahaz, the son of Jehu. “Come, let us meet face to face,” he said.
Context
6Ma o meghị ka ụmụ ndị ogbu mmadụ ahụ nwụọ, nʼusoro ihe e dere nʼakwụkwọ iwu Mosis, ebe Onyenwe anyị nyere iwu sị: “Agaghị eme ka ndị mụrụ ụmụ nwụọ nʼihi ihe ụmụ ha metara, maọbụ mee ka ụmụ nwụọ nʼihi ihe ndị mụrụ ha metara, onye ọbụla ga-anwụ nʼihi mmehie nke aka ya.” 7Amazaya bụ onye gburu puku ndị agha Edọm iri na Ndagwurugwu Nnu, dọtakwa obodo Sela* nʼagha, gụgharịa ya Jekteel,* nke bụ aha a na-akpọ ya ruo ụbọchị taa. 8Mgbe ahụ, Amazaya zigara ndị ozi ka ha jekwuru Jehoash nwa Jehoahaz nwa Jehu, eze Izrel, zie ya ozi ịma aka, sị, “Bịa, ka dimkpa na ibe ya zute ihu na ihu nʼagha.” 9Ma Jehoash eze Izrel zighachiri ozi nye Amazaya eze Juda sị ya, “Uke dị na Lebanọn zigaara osisi sida nke dị na Lebanọn ozi, sị ya, ‘Nye nwa m nwoke nwa gị nwanyị ka ọ bụrụ nwunye ya.’ Mgbe ahụ, anụ ọhịa nke dị na Lebanọn gafetere ebe ahụ, zọpịa uke ahụ. 10I meriela Edọm, nʼezie. Ugbu a, mpako abatala. Ṅụrịa ọṅụ nʼihi mmeri nke i nwetara, ma nọdụ nʼụlọ gị. Nʼihi gịnị ka ị ga-eji kpaliere onwe gị nsogbu, si otu a wetara onwe gị na Juda ọdịda?”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.