2 Ndị Eze 14:10
2 Kings 14:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
I meriela Edọm, nʼezie. Ugbu a, mpako abatala. Ṅụrịa ọṅụ nʼihi mmeri nke i nwetara, ma nọdụ nʼụlọ gị. Nʼihi gịnị ka ị ga-eji kpaliere onwe gị nsogbu, si otu a wetara onwe gị na Juda ọdịda?”
2 Kings 14:10 in English
2 Kings 14:10 · Berean Standard Bible
You have indeed defeated Edom, and your heart has become proud. Glory in that and stay at home. Why should you stir up trouble so that you fall—you and Judah with you?”
Context
8Mgbe ahụ, Amazaya zigara ndị ozi ka ha jekwuru Jehoash nwa Jehoahaz nwa Jehu, eze Izrel, zie ya ozi ịma aka, sị, “Bịa, ka dimkpa na ibe ya zute ihu na ihu nʼagha.” 9Ma Jehoash eze Izrel zighachiri ozi nye Amazaya eze Juda sị ya, “Uke dị na Lebanọn zigaara osisi sida nke dị na Lebanọn ozi, sị ya, ‘Nye nwa m nwoke nwa gị nwanyị ka ọ bụrụ nwunye ya.’ Mgbe ahụ, anụ ọhịa nke dị na Lebanọn gafetere ebe ahụ, zọpịa uke ahụ. 10I meriela Edọm, nʼezie. Ugbu a, mpako abatala. Ṅụrịa ọṅụ nʼihi mmeri nke i nwetara, ma nọdụ nʼụlọ gị. Nʼihi gịnị ka ị ga-eji kpaliere onwe gị nsogbu, si otu a wetara onwe gị na Juda ọdịda?” 11Ma otu ọ dị, Amazaya egeghị ntị. Ya mere, Jehoash bụ eze Izrel buliri agha, ya na Amazaya eze Juda zutere ihu na ihu nʼagha na Bet-Shemesh, dị nʼala Juda. 12Ndị Izrel meriri ndị Juda, mee ka ha gbalaga, nwoke ọbụla nʼụlọ ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.