2 Ndị Eze 14:12
2 Kings 14:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị Izrel meriri ndị Juda, mee ka ha gbalaga, nwoke ọbụla nʼụlọ ya.
2 Kings 14:12 in English
2 Kings 14:12 · Berean Standard Bible
And Judah was routed before Israel, and every man fled to his home.
Context
10I meriela Edọm, nʼezie. Ugbu a, mpako abatala. Ṅụrịa ọṅụ nʼihi mmeri nke i nwetara, ma nọdụ nʼụlọ gị. Nʼihi gịnị ka ị ga-eji kpaliere onwe gị nsogbu, si otu a wetara onwe gị na Juda ọdịda?” 11Ma otu ọ dị, Amazaya egeghị ntị. Ya mere, Jehoash bụ eze Izrel buliri agha, ya na Amazaya eze Juda zutere ihu na ihu nʼagha na Bet-Shemesh, dị nʼala Juda. 12Ndị Izrel meriri ndị Juda, mee ka ha gbalaga, nwoke ọbụla nʼụlọ ya. 13Jehoash bụ eze Izrel nwudere Amazaya bụ eze Juda, nwa Joash, nwa Ahazaya na Bet-Shemesh. Mgbe ahụ, Jehoash gara Jerusalem kwada mgbidi Jerusalem, site nʼỌnụ ụzọ ama Ifrem* ruo nʼọnụ ụzọ ama Nkuku, nke ogologo ya ruru narị nzọ ụkwụ isii. 14Ọ chịkọrọ ọlaedo na ọlaọcha niile na ngwongwo niile ahụtara nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, na nke dị nʼụlọakụ nke ụlọeze. Ọ dọtara ọtụtụ ndị mmadụ nʼagha, kpọrọ laghachi na Sameria.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.