Native Bible

2 Kings 14:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ihe banyere akụkọ ndị ọzọ gbasara ọchịchị Jehoash, na ihe o mere, na ihe ọ rụpụtara, tinyere agha ọ lụrụ megide Amazaya eze Juda, ọ bụ na-edeghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe ndị eze Izrel mere nʼoge ha?

2 Kings 14:15 in English

2 Kings 14:15 · Berean Standard Bible

As for the rest of the acts of Jehoash, along with his accomplishments, his might, and how he waged war against Amaziah king of Judah, are they not written in the Book of the Chronicles of the Kings of Israel?

Context

13Jehoash bụ eze Izrel nwudere Amazaya bụ eze Juda, nwa Joash, nwa Ahazaya na Bet-Shemesh. Mgbe ahụ, Jehoash gara Jerusalem kwada mgbidi Jerusalem, site nʼỌnụ ụzọ ama Ifrem* ruo nʼọnụ ụzọ ama Nkuku, nke ogologo ya ruru narị nzọ ụkwụ isii. 14Ọ chịkọrọ ọlaedo na ọlaọcha niile na ngwongwo niile ahụtara nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, na nke dị nʼụlọakụ nke ụlọeze. Ọ dọtara ọtụtụ ndị mmadụ nʼagha, kpọrọ laghachi na Sameria. 15Ihe banyere akụkọ ndị ọzọ gbasara ọchịchị Jehoash, na ihe o mere, na ihe ọ rụpụtara, tinyere agha ọ lụrụ megide Amazaya eze Juda, ọ bụ na-edeghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe ndị eze Izrel mere nʼoge ha? 16Jehoash sooro nna nna ya ha dinaa nʼọnwụ, e lie ya na Sameria, ebe e liri eze ndị Izrel ndị ọzọ. Jeroboam nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya. 17Amazaya nwa Joash, eze Juda nọrọ ndụ afọ iri na ise, mgbe Jehoash nwa Jehoahaz, eze Izrel nwụsịrị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.