Native Bible

2 Kings 14:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Jehoash sooro nna nna ya ha dinaa nʼọnwụ, e lie ya na Sameria, ebe e liri eze ndị Izrel ndị ọzọ. Jeroboam nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.

2 Kings 14:16 in English

2 Kings 14:16 · Berean Standard Bible

And Jehoash rested with his fathers and was buried in Samaria with the kings of Israel. And his son Jeroboam reigned in his place.

Context

14Ọ chịkọrọ ọlaedo na ọlaọcha niile na ngwongwo niile ahụtara nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, na nke dị nʼụlọakụ nke ụlọeze. Ọ dọtara ọtụtụ ndị mmadụ nʼagha, kpọrọ laghachi na Sameria. 15Ihe banyere akụkọ ndị ọzọ gbasara ọchịchị Jehoash, na ihe o mere, na ihe ọ rụpụtara, tinyere agha ọ lụrụ megide Amazaya eze Juda, ọ bụ na-edeghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe ndị eze Izrel mere nʼoge ha? 16Jehoash sooro nna nna ya ha dinaa nʼọnwụ, e lie ya na Sameria, ebe e liri eze ndị Izrel ndị ọzọ. Jeroboam nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya. 17Amazaya nwa Joash, eze Juda nọrọ ndụ afọ iri na ise, mgbe Jehoash nwa Jehoahaz, eze Izrel nwụsịrị. 18Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Amazaya, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe mere nʼoge ndị eze Juda?

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.