Native Bible

2 Kings 13:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ịlaisha gwakwara eze Izrel okwu sị ya, “Jide ụta ahụ nʼaka gị abụọ.” Mgbe o jidere ụta ahụ Ịlaisha tụkwasịrị aka nke ya nʼaka eze.

2 Kings 13:16 in English

2 Kings 13:16 · Berean Standard Bible

Then Elisha said to the king of Israel, “Put your hand on the bow.” So the king put his hand on the bow, and Elisha put his hands on the king’s hands.

Context

14Nʼoge a, Ịlaisha nọ nʼọrịa nke ọ ga-esite na ya anwụ. Jehoash, bụ eze Izrel gara ịhụ ya, ọ kwara akwa mgbe ọ hụrụ ya sị, “Nna m, nna m, usuu ụgbọ agha na usuu ndị na-agba ịnyịnya Izrel!” 15Ịlaisha gwara ya okwu sị, “Wepụta ụta na àkụ ụfọdụ.” O mere dịka Ịlaisha gwara ya. 16Ịlaisha gwakwara eze Izrel okwu sị ya, “Jide ụta ahụ nʼaka gị abụọ.” Mgbe o jidere ụta ahụ Ịlaisha tụkwasịrị aka nke ya nʼaka eze. 17Ịlaisha gwara ya sị, “Meghee oghereikuku ahụ chere ihu nʼọwụwa anyanwụ.” O meghere ya. Mgbe ahụ Ịlaisha gwara ya sị, “Gbapụ àkụ.” Eze gbapụrụ àkụ. Ịlaisha kwuru sị, “Àkụ mmeri Onyenwe anyị, àkụ mmeri megide Aram. Ị ga-ebibi ndị Aram kpamkpam nʼAfek.” 18Ọ sịrị, “Chilite àkụ ndị ahụ,” ọ chilitere ha. Ịlaisha gwara eze Izrel, “Gbaa ha nʼala.” Ọ gbara ha nʼala ugboro atọ, ma kwụsị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.