Native Bible

2 Kings 13:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼoge a, Ịlaisha nọ nʼọrịa nke ọ ga-esite na ya anwụ. Jehoash, bụ eze Izrel gara ịhụ ya, ọ kwara akwa mgbe ọ hụrụ ya sị, “Nna m, nna m, usuu ụgbọ agha na usuu ndị na-agba ịnyịnya Izrel!”

2 Kings 13:14 in English

2 Kings 13:14 · Berean Standard Bible

When Elisha had fallen sick with the illness from which he would die, Jehoash king of Israel came down to him and wept over him, saying, “My father, my father, the chariots and horsemen of Israel!”

Context

12Akụkọ gbasara ọchịchị Jehoash, na ihe niile o mere, na ihe ọ rụpụtara, tinyere agha o buru megide Amazaya eze Juda, e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe ndị eze Izrel mere nʼoge ha? 13Jehoash soro nna nna ya ha dina nʼọnwụ, Jeroboam anọchie nʼocheeze ya. E liri Jehoash na Sameria, nʼebe e liri ndị eze Izrel ndị ibe ya. 14Nʼoge a, Ịlaisha nọ nʼọrịa nke ọ ga-esite na ya anwụ. Jehoash, bụ eze Izrel gara ịhụ ya, ọ kwara akwa mgbe ọ hụrụ ya sị, “Nna m, nna m, usuu ụgbọ agha na usuu ndị na-agba ịnyịnya Izrel!” 15Ịlaisha gwara ya okwu sị, “Wepụta ụta na àkụ ụfọdụ.” O mere dịka Ịlaisha gwara ya. 16Ịlaisha gwakwara eze Izrel okwu sị ya, “Jide ụta ahụ nʼaka gị abụọ.” Mgbe o jidere ụta ahụ Ịlaisha tụkwasịrị aka nke ya nʼaka eze.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.