Native Bible

2 Kings 13:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ sịrị, “Chilite àkụ ndị ahụ,” ọ chilitere ha. Ịlaisha gwara eze Izrel, “Gbaa ha nʼala.” Ọ gbara ha nʼala ugboro atọ, ma kwụsị.

2 Kings 13:18 in English

2 Kings 13:18 · Berean Standard Bible

Then Elisha said, “Take the arrows!” So he took them, and Elisha said to the king of Israel, “Strike the ground!” So he struck the ground three times and stopped.

Context

16Ịlaisha gwakwara eze Izrel okwu sị ya, “Jide ụta ahụ nʼaka gị abụọ.” Mgbe o jidere ụta ahụ Ịlaisha tụkwasịrị aka nke ya nʼaka eze. 17Ịlaisha gwara ya sị, “Meghee oghereikuku ahụ chere ihu nʼọwụwa anyanwụ.” O meghere ya. Mgbe ahụ Ịlaisha gwara ya sị, “Gbapụ àkụ.” Eze gbapụrụ àkụ. Ịlaisha kwuru sị, “Àkụ mmeri Onyenwe anyị, àkụ mmeri megide Aram. Ị ga-ebibi ndị Aram kpamkpam nʼAfek.” 18Ọ sịrị, “Chilite àkụ ndị ahụ,” ọ chilitere ha. Ịlaisha gwara eze Izrel, “Gbaa ha nʼala.” Ọ gbara ha nʼala ugboro atọ, ma kwụsị. 19Ma onye nke Chineke ahụ were iwe sị ya, “Ị gaara apịa ya nʼala ugboro ise maọbụ isii. Mgbe ahụ, ị gaara enwe ike merie ndị Aram bibie ha kpamkpam. Ma ugbu a, ọ bụ naanị ugbo atọ ka ị ga-emeri ha.” 20Ya mere, Ịlaisha nwụrụ. E likwara ya. Nʼoge ahụ, ọtụtụ ndị na-apụnara mmadụ ihe nʼike na-esi nʼala ndị Moab na-abịa nʼala Izrel izu ohi site nʼọnwa nke atọ nʼafọ ọhụrụ ọbụla.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.