Native Bible

2 Kings 12:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ha na-ewere ego ahụ a gụrụ ọnụ, nyefee nʼaka ndị ikom ahọpụtara maka ilekọta ndị ọrụ na-emezi ụlọ Onyenwe anyị. Ndị ahụ na-eji ya kwụọ ndị ọkwa ǹka osisi na ndị na-ewu ụlọ,

2 Kings 12:11 in English

2 Kings 12:11 · Berean Standard Bible

Then they would put the counted money into the hands of those who supervised the work on the house of the LORD, who in turn would pay those doing the work—the carpenters, builders,

Context

9Mgbe ahụ, Jehoiada wetara otu igbe mepuo oghere nʼelu ya, debe ya nʼakụkụ ebe ịchụ aja, nʼaka nri dịka mmadụ na-abata nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị. Ndị nchụaja niile na-eche nche nʼọnụ ụzọ ụlọnsọ ahụ na-etinye ego niile e webatara nʼụlọnsọ Onyenwe anyị nʼime igbe ahụ. 10Mgbe ọbụla ha hụrụ na igbe ego ahụ ejupụtala nʼego, onye ode akwụkwọ ụlọeze na onyeisi nchụaja na-abịa, gụọ ego ahụ e webatara nʼụlọnsọ Onyenwe anyị, tinye ha nʼakpa. 11Ha na-ewere ego ahụ a gụrụ ọnụ, nyefee nʼaka ndị ikom ahọpụtara maka ilekọta ndị ọrụ na-emezi ụlọ Onyenwe anyị. Ndị ahụ na-eji ya kwụọ ndị ọkwa ǹka osisi na ndị na-ewu ụlọ, 12na ndị na-edo nkume, na ndị na-awa nkume ụgwọ. Ọ bụ sitekwa nʼego ahụ ka a na-azụta osisi na nkume a wara awa iji dozie ụlọnsọ Onyenwe anyị, na ịkwụ ụgwọ ihe ndị ọzọ e ji emezi ihe niile ekwesiri imezi nʼụlọnsọ ukwu ahụ. 13E jikwaghị ego ahụ e webatara nʼụlọnsọ kpụta efere ọlaọcha, ihe e ji akpakepụ ọkụ, efere ịkwọsa mmiri, opi maọbụ ihe ndị ọzọ nke e ji ọlaedo maọbụ ọlaọcha kpụọ maka ụlọnsọ ukwu nke Onyenwe anyị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.