Native Bible

2 Kings 12:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

E jikwaghị ego ahụ e webatara nʼụlọnsọ kpụta efere ọlaọcha, ihe e ji akpakepụ ọkụ, efere ịkwọsa mmiri, opi maọbụ ihe ndị ọzọ nke e ji ọlaedo maọbụ ọlaọcha kpụọ maka ụlọnsọ ukwu nke Onyenwe anyị.

2 Kings 12:13 in English

2 Kings 12:13 · Berean Standard Bible

However, the money brought into the house of the LORD was not used for making silver basins, wick trimmers, sprinkling bowls, trumpets, or any articles of gold or silver for the house of the LORD.

Context

11Ha na-ewere ego ahụ a gụrụ ọnụ, nyefee nʼaka ndị ikom ahọpụtara maka ilekọta ndị ọrụ na-emezi ụlọ Onyenwe anyị. Ndị ahụ na-eji ya kwụọ ndị ọkwa ǹka osisi na ndị na-ewu ụlọ, 12na ndị na-edo nkume, na ndị na-awa nkume ụgwọ. Ọ bụ sitekwa nʼego ahụ ka a na-azụta osisi na nkume a wara awa iji dozie ụlọnsọ Onyenwe anyị, na ịkwụ ụgwọ ihe ndị ọzọ e ji emezi ihe niile ekwesiri imezi nʼụlọnsọ ukwu ahụ. 13E jikwaghị ego ahụ e webatara nʼụlọnsọ kpụta efere ọlaọcha, ihe e ji akpakepụ ọkụ, efere ịkwọsa mmiri, opi maọbụ ihe ndị ọzọ nke e ji ọlaedo maọbụ ọlaọcha kpụọ maka ụlọnsọ ukwu nke Onyenwe anyị. 14Ọ bụ ndị na-eje ozi, ndị ji ya rụzie ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị ka e nyere ya. 15O nweghị onye a sịrị ka ọ gụzie otu e si jiri ego ahụ rụọ ọrụ, bụ ndị e nyere ego ahụ maka ịkwụ ndị ọrụ ụgwọ, nʼihi na ha bụ ndị kwesiri ntụkwasị obi.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.