Native Bible

2 Kings 11:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ya na nwanyị na-elekọta ya anya nọgidere na nzuzo nʼime ụlọnsọ Onyenwe anyị, afọ isii, oge ahụ niile Atalaya na-achị nʼala ahụ.

2 Kings 11:3 in English

2 Kings 11:3 · Berean Standard Bible

And Joash remained hidden with his nurse in the house of the LORD for six years while Athaliah ruled the land.

Context

1Mgbe Atalaya nne Ahazaya hụrụ na nwa ya nwoke anwụọla, ọ gara nʼihu bido igbu ndị niile a mụrụ nʼụlọ eze. 2Ma Jehosheba,* bụ nwa nwanyị eze Jehoram,* ma bụrụkwa nwanne nwanyị Ahazaya, kuuru Joash* nwa Ahazaya, zopu ya site nʼetiti ụmụ ndị ikom eze, bụ ndị a chọrọ igbu egbu. O zoro ya na nwanyị na-elekọta ya anya nʼime ụlọ ndina, ka Atalaya hapụ ịhụ ya, nke a mere na-egbughị ya. 3Ya na nwanyị na-elekọta ya anya nọgidere na nzuzo nʼime ụlọnsọ Onyenwe anyị, afọ isii, oge ahụ niile Atalaya na-achị nʼala ahụ. 4Nʼafọ nke asaa, Jehoiada, ziri ozi kpọọ ndị ọchịagha na-achị narị ndị agha, ndị Karị* na ndị nche oku, mee ka ha bịakwute ya nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị. Ya na ha gbara ndụ, o mekwara ka ha ṅụọ iyi nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị. Mgbe ahụ, o gosiri ha nwa eze.* 5O nyere ha iwu, sị, “Nke a bụ ihe unu ga-eme, unu bụ ndị nọ nʼotu atọ ga-abịa ọrụ nʼụbọchị izuike, nke otu ụzọ nʼime unu na-eche ụlọeze nche,

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.