2 Ndị Eze 11:2
2 Kings 11:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma Jehosheba,* bụ nwa nwanyị eze Jehoram,* ma bụrụkwa nwanne nwanyị Ahazaya, kuuru Joash* nwa Ahazaya, zopu ya site nʼetiti ụmụ ndị ikom eze, bụ ndị a chọrọ igbu egbu. O zoro ya na nwanyị na-elekọta ya anya nʼime ụlọ ndina, ka Atalaya hapụ ịhụ ya, nke a mere na-egbughị ya.
2 Kings 11:2 in English
2 Kings 11:2 · Berean Standard Bible
But Jehosheba * daughter of King Joram,* the sister of Ahaziah, took Joash son of Ahaziah and stole him away from among the sons of the king who were being murdered. She put him and his nurse in a bedroom to hide him from Athaliah, and he was not killed.
Context
1Mgbe Atalaya nne Ahazaya hụrụ na nwa ya nwoke anwụọla, ọ gara nʼihu bido igbu ndị niile a mụrụ nʼụlọ eze. 2Ma Jehosheba,* bụ nwa nwanyị eze Jehoram,* ma bụrụkwa nwanne nwanyị Ahazaya, kuuru Joash* nwa Ahazaya, zopu ya site nʼetiti ụmụ ndị ikom eze, bụ ndị a chọrọ igbu egbu. O zoro ya na nwanyị na-elekọta ya anya nʼime ụlọ ndina, ka Atalaya hapụ ịhụ ya, nke a mere na-egbughị ya. 3Ya na nwanyị na-elekọta ya anya nọgidere na nzuzo nʼime ụlọnsọ Onyenwe anyị, afọ isii, oge ahụ niile Atalaya na-achị nʼala ahụ. 4Nʼafọ nke asaa, Jehoiada, ziri ozi kpọọ ndị ọchịagha na-achị narị ndị agha, ndị Karị* na ndị nche oku, mee ka ha bịakwute ya nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị. Ya na ha gbara ndụ, o mekwara ka ha ṅụọ iyi nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị. Mgbe ahụ, o gosiri ha nwa eze.*
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.