2 Ndị Eze 11:1
2 Kings 11:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe Atalaya nne Ahazaya hụrụ na nwa ya nwoke anwụọla, ọ gara nʼihu bido igbu ndị niile a mụrụ nʼụlọ eze.
2 Kings 11:1 in English
2 Kings 11:1 · Berean Standard Bible
When Athaliah the mother of Ahaziah saw that her son was dead, she proceeded to annihilate all the royal heirs.
Context
1Mgbe Atalaya nne Ahazaya hụrụ na nwa ya nwoke anwụọla, ọ gara nʼihu bido igbu ndị niile a mụrụ nʼụlọ eze. 2Ma Jehosheba,* bụ nwa nwanyị eze Jehoram,* ma bụrụkwa nwanne nwanyị Ahazaya, kuuru Joash* nwa Ahazaya, zopu ya site nʼetiti ụmụ ndị ikom eze, bụ ndị a chọrọ igbu egbu. O zoro ya na nwanyị na-elekọta ya anya nʼime ụlọ ndina, ka Atalaya hapụ ịhụ ya, nke a mere na-egbughị ya. 3Ya na nwanyị na-elekọta ya anya nọgidere na nzuzo nʼime ụlọnsọ Onyenwe anyị, afọ isii, oge ahụ niile Atalaya na-achị nʼala ahụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.