Native Bible

2 Kings 10:35 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Jehu sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya na Sameria. Nwa ya bụ Jehoahaz nọchiri anya ya dịka eze.

2 Kings 10:35 in English

2 Kings 10:35 · Berean Standard Bible

And Jehu rested with his fathers and was buried in Samaria, and his son Jehoahaz reigned in his place.

Context

33nke dị nʼọwụwa anyanwụ osimiri Jọdan, na ala niile nke Gilead (nʼoke ala ndị Gad, na nke ndị Ruben, na Manase), site nʼAroea nke dị nʼakụkụ ndagwurugwu Anọn, ruo Gilead na Bashan. 34Akụkọ gbasara ọchịchị eze Jehu, na ihe niile o mere, na ịkpa ike ya niile, e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ndị eze Izrel? 35Jehu sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya na Sameria. Nwa ya bụ Jehoahaz nọchiri anya ya dịka eze. 36Ma ụbọchị niile Jehu bụ eze Izrel nʼime Sameria dị iri afọ abụọ na asatọ. 10:1 Sameria, bụ isi obodo alaeze Ugwu, site nʼoge eze Omri chịrị Izrel. 1Ez 16:24 10:4 Eze abụọ a na-ekwu banyere ha nʼebe a, bụ Joram na Ahazaya. 2Ez 9:23-28 10:15 Ndị Rekab, bụ ndị sitere nʼagbụrụ Rekab, onye sitere nʼagbụrụ ndị Kena. Ha bụ agbụrụ na-ebi ndụ ogologo nʼihi na anyị nụrụ ihe banyere ha nʼakwụkwọ onye amụma Jer 35:5-10 Ha nʼebi nʼụlọ ikwu, bụrụkwa ndị nwere ezi ịnụ ọkụ nʼobi banyere ihe Chineke. Jetro, ọgọ nwoke Mosis si nʼagbụrụ a. Ọpụ 3:1; 4:18; 18:5; Ọnụ 10:29 10:21 Ehab bụ onye wuru ebe a, nke a na-anọ achụrụ arụsị Baal aja na Sameria. 1Ez 16:32

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.