Native Bible

2 Kings 1:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼihi nke a, otu a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Ị gaghị esite nʼelu ihe ndina ahụ bilie. Ị ghaghị ịnwụ!’ ” Ya mere Ịlaịja pụrụ gaa zie ndị ozi eze ozi ahụ.

2 Kings 1:4 in English

2 Kings 1:4 · Berean Standard Bible

Therefore this is what the LORD says: ‘You will not get up from the bed on which you are lying. You will surely die.’” So Elijah departed.

Context

2Nʼoge a, Ahazaya sitere na mgbe ụlọ elu ya dị na Sameria daa, merụọ ahụ nke ukwuu. Nʼihi ọrịa a, o zigara ndị ozi, sị ha, “Gaa jụta ase nʼaka Baal-Zebub,* bụ chi Ekrọn, ma m ga-adịrị site nʼihe mmerụ ahụ a.” 3Ma mmụọ ozi Onyenwe anyị gwara Ịlaịja onye Tishbe okwu sị ya, “Gaa zute ndị ozi eze Sameria zipụrụ, jụọ ha sị, ‘Gịnị mere unu ji aga Ekrọn ịjụ ase? Ọ bụ na Chineke anọghị nʼIzrel mere unu ji aga ịjụ Baal-Zebub ase ịmata ma eze ọ ga-adị ndụ?’ 4Nʼihi nke a, otu a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Ị gaghị esite nʼelu ihe ndina ahụ bilie. Ị ghaghị ịnwụ!’ ” Ya mere Ịlaịja pụrụ gaa zie ndị ozi eze ozi ahụ. 5Ndị ozi ahụ laghachiri azụ. Ma mgbe eze hụrụ ha, ọ jụrụ ha sị, “Gịnị mere unu ji lọghachi?” 6Ha zara ya, “Otu nwoke zutere anyị nʼụzọ sị anyị, ‘Laghachi ga zie eze ahụ zitere unu sị ya: “Ihe ndị a, ka Onyenwe anyị kwuru, Ọ bụ nʼihi na Chineke anọghị nʼIzrel ka i ji zipụ ndị mmadụ ka ha gaa jụta ase site nʼaka Baal-Zebub, chi ndị Ekrọn? Nʼihi nke a, ị gaghị esite nʼihe ndina gị bilie. Ya doo gị anya na ị ghaghị ịnwụ!” ’ ”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.