Native Bible

2 Corinthians 8:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼihi na unu maara ụdị amara nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst nwere. Ọ bụ ezie na ọ bụ ọgaranya, ma ọ họọrọ ịbụ ogbenye nʼihi unu, ka unu onwe unu site nʼogbenye ya bụrụ ọgaranya.

2 Corinthians 8:9 in English

2 Corinthians 8:9 · Berean Standard Bible

For you know the grace of our Lord Jesus Christ, that though He was rich, yet for your sakes He became poor, so that you through His poverty might become rich.

Context

7Ma ebe unu babigara ụba oke nʼihe niile unu nwere, nʼokwukwe, na okwu, nʼihe ọmụma, na ịnụ ọkụ nʼobi, na ịhụnanya unu hụrụ anyị, lezie unu anya hụ na unu babigakwara ụba oke nʼamara nke inye ihe a. 8Anaghị m enye unu iwu, kama site nʼizi unu otu o si na-anụ ndị ọzọ ọkụ nʼobi inyeaka, achọrọ m ịchọpụta ma ịhụnanya unu na ịnụ ọkụ nʼobi unu ọ ga-adakọtakwa. 9Nʼihi na unu maara ụdị amara nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst nwere. Ọ bụ ezie na ọ bụ ọgaranya, ma ọ họọrọ ịbụ ogbenye nʼihi unu, ka unu onwe unu site nʼogbenye ya bụrụ ọgaranya. 10Nke a bụ ndụmọdụ m na-enye unu nʼokwu a. Ọ baara unu uru ka unu rụzuo ọrụ unu malitere ịrụ nʼafọ gara aga. Unu bụ ndị mbụ buru ụzọ chepụta ịrụ ọrụ a, unu bụkwa ndị mbụ buru ụzọ malite ime ihe banyere ya. 11Ma ugbu a mezuonụ ihe unu chepụtara ime. Ka ịnụ ọkụ nʼobi unu nwere na mbụ ịrụ ọrụ a bụrụkwa ihe unu ga-eji mezuo ya dịka ihe unu nwere si dị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.