Native Bible

2 Corinthians 8:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nke a bụ ndụmọdụ m na-enye unu nʼokwu a. Ọ baara unu uru ka unu rụzuo ọrụ unu malitere ịrụ nʼafọ gara aga. Unu bụ ndị mbụ buru ụzọ chepụta ịrụ ọrụ a, unu bụkwa ndị mbụ buru ụzọ malite ime ihe banyere ya.

2 Corinthians 8:10 in English

2 Corinthians 8:10 · Berean Standard Bible

And this is my opinion about what is helpful for you in this matter: Last year you were the first not only to give, but even to have such a desire.

Context

8Anaghị m enye unu iwu, kama site nʼizi unu otu o si na-anụ ndị ọzọ ọkụ nʼobi inyeaka, achọrọ m ịchọpụta ma ịhụnanya unu na ịnụ ọkụ nʼobi unu ọ ga-adakọtakwa. 9Nʼihi na unu maara ụdị amara nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst nwere. Ọ bụ ezie na ọ bụ ọgaranya, ma ọ họọrọ ịbụ ogbenye nʼihi unu, ka unu onwe unu site nʼogbenye ya bụrụ ọgaranya. 10Nke a bụ ndụmọdụ m na-enye unu nʼokwu a. Ọ baara unu uru ka unu rụzuo ọrụ unu malitere ịrụ nʼafọ gara aga. Unu bụ ndị mbụ buru ụzọ chepụta ịrụ ọrụ a, unu bụkwa ndị mbụ buru ụzọ malite ime ihe banyere ya. 11Ma ugbu a mezuonụ ihe unu chepụtara ime. Ka ịnụ ọkụ nʼobi unu nwere na mbụ ịrụ ọrụ a bụrụkwa ihe unu ga-eji mezuo ya dịka ihe unu nwere si dị. 12Nʼihi na ọ bụrụ na ịnụ ọkụ nʼobi dị ebe ahụ, a na-anara ya dịka ihe mmadụ nwere ike inye, ọ bụghị ihe ọ na-enweghị ike inye.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.