Native Bible

2 Corinthians 13:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Werenụ isurita ọnụ dị nsọ kelerịta onwe unu.

2 Corinthians 13:12 in English

2 Corinthians 13:12 · Berean Standard Bible

Greet one another with a holy kiss.

Context

10Ana m edere unu akwụkwọ a ugbu a, nʼihi na-achọghị m ịbara unu mba na inye unu ntaramahụhụ mgbe m bịara. Achọkwaghị m iji ikike ahụ Onyenwe anyị nyere m nye unu ntaramahụhụ, kama achọrọ m iji ya wulie unu elu dịka ụlọ. 11Nʼikpeazụ ụmụnna m, na-aṅụrịnụ ọṅụ. Gbalịanụ nʼimezi ndụ unu ka o zuo oke, na-agbarịta onwe ume, werenụ otu obi na-eme ihe, na-ebikwanụ nʼudo. Chineke nke udo na ịhụnanya ga-anọnyekwara unu. 12Werenụ isurita ọnụ dị nsọ kelerịta onwe unu. 13Ndị nsọ niile na-ekelekwa unu. 14Ka amara Onyenwe anyị Jisọs Kraịst na ịhụnanya Chineke, na mmekọ nke Mmụọ Nsọ dịnyere unu niile. 13:1 Dit 19:15

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.