2 Ndị Kọrint 11:28
2 Corinthians 11:28 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma e wezuga ihe ndị a niile, ana m anọ nʼechiche mgbe niile banyere otu ihe niile si aga nʼime nzukọ.
2 Corinthians 11:28 in English
2 Corinthians 11:28 · Berean Standard Bible
Apart from these external trials, I face daily the pressure of my concern for all the churches.
Context
26Ejeela m ọtụtụ ogologo ije nke ọtụtụ ihe ize ndụ dị nʼime ya. Nʼize ndụ site nʼosimiri, ize ndụ site na ndị na-apụnarị mmadụ ihe nʼike, ize ndụ site nʼaka ndị obodo nke aka m. Ọtụtụ mgbe ka m zere ndụ site nʼaka ndị mba ọzọ, nʼime obodo ukwu, nʼọzara ma nʼoke osimiri; na nʼaka ndị kpọrọ onwe ha ụmụnna m, ma ha bụ ndị ụgha. 27Adọgbuola m onwe m nʼọrụ, anọọla m nʼọnọdụ ịhụju anya na ịmụ anya ọtụtụ abalị. Ọtụtụ mgbe ana m anọ agụụ na-erighị ihe ọbụla, maọbụ ịṅụ ihe ọbụla. Anọọla m ọtụtụ mgbe nʼoge oyi na-ama jijiji nʼihi enweghị uwe dị mma m ji achụ oyi. 28Ma e wezuga ihe ndị a niile, ana m anọ nʼechiche mgbe niile banyere otu ihe niile si aga nʼime nzukọ. 29Onye bụ onye ahụ na-adịghị ike nke m na-adịghị eso ya kere oke na-adịghị ike ya? Onye ka e dubara na mmehie nke ọnọdụ ya na-adịghị emetụ m nʼobi? 30Kama ọ bụrụ na o kwesiri ka m nyaa isi aga m anya isi banyere ihe ndị ahụ na-egosi adịghị ike m.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.