Native Bible

2 Corinthians 11:27 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Adọgbuola m onwe m nʼọrụ, anọọla m nʼọnọdụ ịhụju anya na ịmụ anya ọtụtụ abalị. Ọtụtụ mgbe ana m anọ agụụ na-erighị ihe ọbụla, maọbụ ịṅụ ihe ọbụla. Anọọla m ọtụtụ mgbe nʼoge oyi na-ama jijiji nʼihi enweghị uwe dị mma m ji achụ oyi.

2 Corinthians 11:27 in English

2 Corinthians 11:27 · Berean Standard Bible

in labor and toil and often without sleep, in hunger and thirst and often without food, in cold and exposure.

Context

25E jirila okporo igwe tie m ugboro atọ. Atụrụ m nkume otu ugboro. Ugboro atọ ka ụgbọ mmiri m nọ nʼime ya kpuru nʼoke osimiri. Anọọla m otu abalị na ụbọchị so ya nʼelu oke osimiri ebe mmiri na-ebugharị m. 26Ejeela m ọtụtụ ogologo ije nke ọtụtụ ihe ize ndụ dị nʼime ya. Nʼize ndụ site nʼosimiri, ize ndụ site na ndị na-apụnarị mmadụ ihe nʼike, ize ndụ site nʼaka ndị obodo nke aka m. Ọtụtụ mgbe ka m zere ndụ site nʼaka ndị mba ọzọ, nʼime obodo ukwu, nʼọzara ma nʼoke osimiri; na nʼaka ndị kpọrọ onwe ha ụmụnna m, ma ha bụ ndị ụgha. 27Adọgbuola m onwe m nʼọrụ, anọọla m nʼọnọdụ ịhụju anya na ịmụ anya ọtụtụ abalị. Ọtụtụ mgbe ana m anọ agụụ na-erighị ihe ọbụla, maọbụ ịṅụ ihe ọbụla. Anọọla m ọtụtụ mgbe nʼoge oyi na-ama jijiji nʼihi enweghị uwe dị mma m ji achụ oyi. 28Ma e wezuga ihe ndị a niile, ana m anọ nʼechiche mgbe niile banyere otu ihe niile si aga nʼime nzukọ. 29Onye bụ onye ahụ na-adịghị ike nke m na-adịghị eso ya kere oke na-adịghị ike ya? Onye ka e dubara na mmehie nke ọnọdụ ya na-adịghị emetụ m nʼobi?

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.