2 Ndị Kọrint 11:21
2 Corinthians 11:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼezie, ọ bụ ihere m, ịnabata na anyị bụ ndị na-adịghị ike nʼezie nye nke a. Ọ bụrụ na onye ọbụla anwaa anwaa nyaa isi nʼihe ọbụla (ana m ekwu dịka onye nʼenweghị uche), mụ onwe m ga-anyakwa isi.
2 Corinthians 11:21 in English
2 Corinthians 11:21 · Berean Standard Bible
To my shame I concede that we were too weak for that! Speaking as a fool, however, I can match what anyone else dares to boast about.
Context
19Unu were obi ụtọ na-anagide ndị na-enweghị uche, ebe unu onwe unu nwere uche. 20Unu na-anagide ya ma ọ bụrụ na onye ọbụla eme unu ndị ohu ha, maọbụ jiri anya ike nakọrọ unu ihe unu nwere, maọbụ ghọgbuo unu, maọbụ bulie onwe ya elu dịka ha karịrị unu, maọbụ maa unu uraa nʼihu. 21Nʼezie, ọ bụ ihere m, ịnabata na anyị bụ ndị na-adịghị ike nʼezie nye nke a.
Ọ bụrụ na onye ọbụla anwaa anwaa nyaa isi nʼihe ọbụla (ana m ekwu dịka onye nʼenweghị uche), mụ onwe m ga-anyakwa isi. 22Ha bụ ndị Hibru? Mụ onwe m bụkwa ya. Ha bụ ndị Izrel? Mụ onwe m bụkwa ya. Ha bụ ndị agbụrụ Ebraham? Mụ onwe m bụkwa. 23Ha bụ ndị na-ejere Kraịst ozi? (Ana m ekwu dịka onye anya na-adịghị mma.) Ma mụ onwe m ejela ozi karịa. Adọgbuola m onwe m nʼọrụ karịa ha niile. Etinyela m nʼụlọ mkpọrọ ọtụtụ mgbe, tinyere ọtụtụ ihe otiti, mgbe mgbe anọọla m nʼọnụ ọnwụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.